Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Listen to Job 16
1Mgbe ahụ, Job zara sị: 2“Anụla m ọtụtụ ihe dịka ndị a; ndị nkasiobi na-eweta ọnọdụ ọjọọ ka unu niile bụ. 3Ogologo okwu efu ndị a niile unu na-ekwu, ọ naghị akwụsị? Gịnị bụ nsogbu unu nke mere unu ji aga nʼihu na-arụ ụka niile ndị a? 4Mụ onwe m nwekwara ike ikwu okwu dịka unu, ma ọ bụrụ na unu nọ nʼọnọdụ m; enwere m ike kwuo okwu dị ụtọ na ntị megide unu, ma fufekwaa isi* m megide unu. 5Ma ọnụ m ga-agba unu ume; nkasiobi si nʼegbugbere ọnụ m ga-emekwa ka ihe mgbu unu dajụọ. 6“Ma ọ bụrụ na m ekwuo, adịghị egbochi ihe mgbu m, ọ bụrụ na m ahapụ ikwu okwu, ọdịghị esi nʼahụ m pụọ? 7Nʼezie o Chineke, i meela ka ike gwụ m, i tidakwala ezinaụlọ m. 8I keela m agbụ; agbụ m abụrụla ihe akaebe megide m; ịta ahụ m ebiliela ịgba akaebe megide m. 9Chineke na-eweso m iwe, jiri iwe ya na-adọwasị m, ọ na-atakwa ikikere eze ya megide m; onye iro m na-achịchapụrụ m anya ya. 10Ụmụ mmadụ na-asaghe ọnụ ka ha chịa m ọchị, ha ji iti m aka nʼọnụ na-akwa m emo, jikọtakwa onwe ha megide m. 11Chineke ewerela m nyefee nʼaka ndị ajọ omume, tụbakwa m nʼaka ndị na-emebi iwu. 12Ihe na-agara m nke ọma, ma Chineke tipịara m. O jidere m nʼolu ma tiwasịa m. O meela m ihe ịgba ụta ya; 13ndị ọgba ụta ya agbaala m gburugburu. Ọ na-agbawa akụrụ m na-enweghị ọmịiko mee ka oluilu m wụsịa nʼala. 14Mgbe niile, ọ na-emegide m; ọ na-achụso m dịka dike nʼagha. 15“Adụkọtala m akwa mkpe were ya kpuchie anụ ahụ m, liekwa ikuanya* m nʼime ntụ. 16Ihu m na-acha ọbara ọbara site nʼakwa nke m na-akwa, onyinyo nke ọnwụ dịkwa gburugburu egbugbere anya m abụọ; 17ma aka m emeghị ihe ike ọbụla, ọzọ ekpere m dịkwa ọcha. 18“Ala, biko, ezokwala ọbara m; mee ka akwa m ghara ịbụ ihe lara nʼiyi! 19Ọ bụladị ugbu a, onye akaebe m nọ nʼeluigwe, onye nkwuchite ọnụ m nọ nʼebe dị elu. 20Onye na-arịọrọ m arịrịọ bụ enyi m, dịka m na-awụsara Chineke anya mmiri m. 21Nʼọnọdụ mmadụ ka ọ na-arịọ Chineke dịka mmadụ na-arịọ nʼihi enyi ya. 22“Naanị afọ ole na ole ga-agabiga tupu m ga nʼụzọ nke nlọghachi m na-adịghị. 16:4 Ifufe isi nʼihu mmadụ, bụ omume nlelị anya. Ọ pụtara na e nweghị nsọpụrụ nʼebe onye dị otu a nọ. Abụ 22:7; Akw 2:15; Mat 27:39 16:15 Maọbụ, mpi

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.