Job 16:4
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mụ onwe m nwekwara ike ikwu okwu dịka unu, ma ọ bụrụ na unu nọ nʼọnọdụ m; enwere m ike kwuo okwu dị ụtọ na ntị megide unu, ma fufekwaa isi* m megide unu.
Job 16:4 in English
Job 16:4 · Berean Standard Bible
I could also speak like you if you were in my place; I could heap up words against you and shake my head at you.
Context
2“Anụla m ọtụtụ ihe dịka ndị a;
ndị nkasiobi na-eweta ọnọdụ ọjọọ ka unu niile bụ. 3Ogologo okwu efu ndị a niile unu na-ekwu, ọ naghị akwụsị?
Gịnị bụ nsogbu unu nke mere unu ji aga nʼihu na-arụ ụka niile ndị a? 4Mụ onwe m nwekwara ike ikwu okwu dịka unu,
ma ọ bụrụ na unu nọ nʼọnọdụ m;
enwere m ike kwuo okwu dị ụtọ na ntị megide unu,
ma fufekwaa isi* m megide unu. 5Ma ọnụ m ga-agba unu ume;
nkasiobi si nʼegbugbere ọnụ m ga-emekwa ka ihe mgbu unu dajụọ. 6“Ma ọ bụrụ na m ekwuo, adịghị egbochi ihe mgbu m,
ọ bụrụ na m ahapụ ikwu okwu, ọdịghị esi nʼahụ m pụọ?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.