Job 16:10
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ụmụ mmadụ na-asaghe ọnụ ka ha chịa m ọchị, ha ji iti m aka nʼọnụ na-akwa m emo, jikọtakwa onwe ha megide m.
Job 16:10 in English
Job 16:10 · Berean Standard Bible
They open their mouths against me and strike my cheeks with contempt; they join together against me.
Context
8I keela m agbụ; agbụ m abụrụla ihe akaebe megide m;
ịta ahụ m ebiliela ịgba akaebe megide m. 9Chineke na-eweso m iwe, jiri iwe ya na-adọwasị m,
ọ na-atakwa ikikere eze ya megide m;
onye iro m na-achịchapụrụ m anya ya. 10Ụmụ mmadụ na-asaghe ọnụ ka ha chịa m ọchị,
ha ji iti m aka nʼọnụ na-akwa m emo,
jikọtakwa onwe ha megide m. 11Chineke ewerela m nyefee nʼaka ndị ajọ omume,
tụbakwa m nʼaka ndị na-emebi iwu. 12Ihe na-agara m nke ọma, ma Chineke tipịara m.
O jidere m nʼolu ma tiwasịa m.
O meela m ihe ịgba ụta ya;
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.