Job 16:9
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Chineke na-eweso m iwe, jiri iwe ya na-adọwasị m, ọ na-atakwa ikikere eze ya megide m; onye iro m na-achịchapụrụ m anya ya.
Job 16:9 in English
Job 16:9 · Berean Standard Bible
His anger has torn me and opposed me; He gnashes His teeth at me. My adversary pierces me with His eyes.
Context
7Nʼezie o Chineke, i meela ka ike gwụ m,
i tidakwala ezinaụlọ m. 8I keela m agbụ; agbụ m abụrụla ihe akaebe megide m;
ịta ahụ m ebiliela ịgba akaebe megide m. 9Chineke na-eweso m iwe, jiri iwe ya na-adọwasị m,
ọ na-atakwa ikikere eze ya megide m;
onye iro m na-achịchapụrụ m anya ya. 10Ụmụ mmadụ na-asaghe ọnụ ka ha chịa m ọchị,
ha ji iti m aka nʼọnụ na-akwa m emo,
jikọtakwa onwe ha megide m. 11Chineke ewerela m nyefee nʼaka ndị ajọ omume,
tụbakwa m nʼaka ndị na-emebi iwu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.