Job 16:7
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼezie o Chineke, i meela ka ike gwụ m, i tidakwala ezinaụlọ m.
Job 16:7 in English
Job 16:7 · Berean Standard Bible
Surely He has now exhausted me; You have devastated all my family.
Context
5Ma ọnụ m ga-agba unu ume;
nkasiobi si nʼegbugbere ọnụ m ga-emekwa ka ihe mgbu unu dajụọ. 6“Ma ọ bụrụ na m ekwuo, adịghị egbochi ihe mgbu m,
ọ bụrụ na m ahapụ ikwu okwu, ọdịghị esi nʼahụ m pụọ? 7Nʼezie o Chineke, i meela ka ike gwụ m,
i tidakwala ezinaụlọ m. 8I keela m agbụ; agbụ m abụrụla ihe akaebe megide m;
ịta ahụ m ebiliela ịgba akaebe megide m. 9Chineke na-eweso m iwe, jiri iwe ya na-adọwasị m,
ọ na-atakwa ikikere eze ya megide m;
onye iro m na-achịchapụrụ m anya ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.