Job 16:11
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Chineke ewerela m nyefee nʼaka ndị ajọ omume, tụbakwa m nʼaka ndị na-emebi iwu.
Job 16:11 in English
Job 16:11 · Berean Standard Bible
God has delivered me to unjust men; He has thrown me to the clutches of the wicked.
Context
9Chineke na-eweso m iwe, jiri iwe ya na-adọwasị m,
ọ na-atakwa ikikere eze ya megide m;
onye iro m na-achịchapụrụ m anya ya. 10Ụmụ mmadụ na-asaghe ọnụ ka ha chịa m ọchị,
ha ji iti m aka nʼọnụ na-akwa m emo,
jikọtakwa onwe ha megide m. 11Chineke ewerela m nyefee nʼaka ndị ajọ omume,
tụbakwa m nʼaka ndị na-emebi iwu. 12Ihe na-agara m nke ọma, ma Chineke tipịara m.
O jidere m nʼolu ma tiwasịa m.
O meela m ihe ịgba ụta ya; 13ndị ọgba ụta ya agbaala m gburugburu.
Ọ na-agbawa akụrụ m na-enweghị ọmịiko
mee ka oluilu m wụsịa nʼala.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.