Job 16:13
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
ndị ọgba ụta ya agbaala m gburugburu. Ọ na-agbawa akụrụ m na-enweghị ọmịiko mee ka oluilu m wụsịa nʼala.
Job 16:13 in English
Job 16:13 · Berean Standard Bible
His archers surround me. He pierces my kidneys without mercy and spills my gall on the ground.
Context
11Chineke ewerela m nyefee nʼaka ndị ajọ omume,
tụbakwa m nʼaka ndị na-emebi iwu. 12Ihe na-agara m nke ọma, ma Chineke tipịara m.
O jidere m nʼolu ma tiwasịa m.
O meela m ihe ịgba ụta ya; 13ndị ọgba ụta ya agbaala m gburugburu.
Ọ na-agbawa akụrụ m na-enweghị ọmịiko
mee ka oluilu m wụsịa nʼala. 14Mgbe niile, ọ na-emegide m;
ọ na-achụso m dịka dike nʼagha. 15“Adụkọtala m akwa mkpe were ya kpuchie anụ ahụ m,
liekwa ikuanya* m nʼime ntụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.