Job 16:12
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ihe na-agara m nke ọma, ma Chineke tipịara m. O jidere m nʼolu ma tiwasịa m. O meela m ihe ịgba ụta ya;
Job 16:12 in English
Job 16:12 · Berean Standard Bible
I was at ease, but He shattered me; He seized me by the neck and crushed me. He has set me up as His target;
Context
10Ụmụ mmadụ na-asaghe ọnụ ka ha chịa m ọchị,
ha ji iti m aka nʼọnụ na-akwa m emo,
jikọtakwa onwe ha megide m. 11Chineke ewerela m nyefee nʼaka ndị ajọ omume,
tụbakwa m nʼaka ndị na-emebi iwu. 12Ihe na-agara m nke ọma, ma Chineke tipịara m.
O jidere m nʼolu ma tiwasịa m.
O meela m ihe ịgba ụta ya; 13ndị ọgba ụta ya agbaala m gburugburu.
Ọ na-agbawa akụrụ m na-enweghị ọmịiko
mee ka oluilu m wụsịa nʼala. 14Mgbe niile, ọ na-emegide m;
ọ na-achụso m dịka dike nʼagha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.