Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1Mgbe ahụ, Elifaz onye Teman zara sị: 2“Onye maara ihe ọ ga-eji okwu na-abaghị uru zaghachi?
Ọ ga-emeju afọ ya nʼifufe na-ekpo ọkụ nke si nʼọwụwa anyanwụ? 3Ọ ga-eji okwu na-abaghị uru rụọ ụka,
maọbụ kwuo okwu na-enweghị isi? 4Ma ị na-eleda ezi omume anya
na-egbochikwa ịsọpụrụ Chineke. 5Mmehie gị na-eme ka ọnụ gị kwuo okwu ngwangwa;
ọ bụkwa ire ndị aghụghọ ka i nwere. 6Ọnụ gị na-ama gị ikpe, ọ bụghị mụ onwe m,
egbugbere ọnụ gị na-ekwu okwu megide gị. 7“Ị bụ mmadụ mbụ a mụrụ?
A mụọla gị tupu e kee ugwu niile? 8Ọ getụla ntị nʼizu nzuzo nke Chineke?
Amamihe niile ọ bụ nʼime gị ka ha juru? 9Gịnị ka ị maara nke anyị na-amaghị?
Ụdị nghọta dị aṅaa ka i nwere nke anyị na-enweghị? 10Ndịisi awọ na ndị kara nka nọ nʼetiti anyị,
ndị ikom mere agadi karịa nna mụrụ gị. 11Ọ ga-abụ na nkasiobi Chineke bụrụ gị ihe nta,
ka ọ bụ okwu dị nro nke ọ gwara gị? 12Gịnị mere obi gị ji duhie gị,
gịnị mekwara anya gị abụọ ji chagharịa, 13nke mere iwe gị jiri dị ọkụ megide Chineke,
meekwa ka okwu ọjọọ ndị a niile si nʼọnụ gị pụta? 14“Gịnị ka mmadụ efu bụ, ọ ga-eji dị ọcha nʼobi,
gịnị ka mmadụ nwanyị mụrụ bụ, na ha nwere ike ị bụ ndị ezi omume? 15Ọ bụrụ na Chineke atụkwasịghị ndị nsọ ya obi,
ọ bụrụkwa na eluigwe adịghị ọcha nʼanya ya, 16ọ ga-esi aṅaa tụkwasị mmadụ efu onye rụrụ arụ obi,
bụ onye na-aṅụ ajọ omume dịka mmiri. 17“Gee m ntị ka m kọwaara gị;
kwerekwa ka m gwa gị ihe m hụrụ, 18bụ ihe ndị amamihe kwuru,
ndị na-ezobeghị ihe ha natara nʼaka nna nna ha, 19bụ ndị e nyefere ala ndị a nʼaka ha
mgbe ọ dịghị onye ọbịa gabigara nʼetiti ha. 20Ụbọchị ndụ ya niile, onye ajọ omume na-ata ahụhụ mmekpa ahụ,
bụ nke e debere ogologo afọ nye nwoke ahụ na-eme ihe ike. 21Ụzụ na-eweta oke egwu na-eju ya ntị,
mgbe ọ dị ka ihe niile na-aga nke ọma, ndị na-apụnara mmadụ ihe na-abịakwasị ya. 22O nweghị olileanya ịgbanarị ọchịchịrị;
mma agha nọ na-echere ya. 23Ọ na-akpagharị na-achọ ebe nri dịka udele;
ọ makwara na ụbọchị ọchịchịrị nọ nso. 24Ahụhụ na mkpagbu na-eme ka ọ tụọ oke egwu,
nsogbu na-abịakwasị ya dịka eze nke nọ na njikere ibuso ndị iro ya agha. 25Nʼihi na ọ na-atụ Chineke aka nʼihu,
dokwaa onwe ya imegide Onye pụrụ ime ihe niile. 26O ji ikwesi olu ike,
dịka ọta siri ike, na-emegide Chineke. 27“Ọ bụ ezie na abụba kpuchiri ihu ya,
abụba nke dị nʼukwu ya na-eme ka anụ ahụ nupụtakwa, 28ọ ga-ebi nʼobodo e bibiri ebibi,
nʼụlọ nke mmadụ na-ekwesighị ibi nʼime ha,
ụlọ nke na-adakasị adakasị. 29Ma ọ gaghị aga nʼihu ị bụ ọgaranya, akụ ya agaghị adịgidekwa.
Ihe o nwere agakwaghị agbasapụ nʼala niile ahụ. 30Ọ gaghị agbanarị ọchịchịrị,
ire ọkụ ga-eme ka ome ya kpọnwụọ,
iku ume nke ọnụ Chineke ga-ebufu ya. 31Ka onye dị otu a hapụ ịghọgbu onwe ya site nʼịtụkwasị uche nʼihe efu,
nʼihi na ọ dịghị ụgwọ ọrụ ọbụla ọ ga-enweta. 32Tụpụ oge ya eruo, ọ ga-anata ụgwọ ọrụ ya nʼuju,
ọzọ, alaka ya ga-akpọnwụ 33Ọ ga-adị ka osisi vaịnị nke mkpụrụ ya dapụsịrị na-achaghị acha,
dịka osisi oliv nke akwụkwọ ya kpọnwụrụ akpọnwụ. 34Nʼihi na ndị na-amaghị Chineke ga-adị ka nwanyị aga,
ọkụ ga-erepịa ụlọ ikwu niile nke ndị hụrụ iri ngarị nʼanya. 35Ha na-atụrụ ihe ọjọọ dịka ime, ma mụọkwa ajọọ omume;
naanị aghụghọ ka akpanwa ha na-arụpụta.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.