Job 15:31
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ka onye dị otu a hapụ ịghọgbu onwe ya site nʼịtụkwasị uche nʼihe efu, nʼihi na ọ dịghị ụgwọ ọrụ ọbụla ọ ga-enweta.
Job 15:31 in English
Job 15:31 · Berean Standard Bible
Let him not deceive himself with trust in emptiness, for emptiness will be his reward.
Context
29Ma ọ gaghị aga nʼihu ị bụ ọgaranya, akụ ya agaghị adịgidekwa.
Ihe o nwere agakwaghị agbasapụ nʼala niile ahụ. 30Ọ gaghị agbanarị ọchịchịrị,
ire ọkụ ga-eme ka ome ya kpọnwụọ,
iku ume nke ọnụ Chineke ga-ebufu ya. 31Ka onye dị otu a hapụ ịghọgbu onwe ya site nʼịtụkwasị uche nʼihe efu,
nʼihi na ọ dịghị ụgwọ ọrụ ọbụla ọ ga-enweta. 32Tụpụ oge ya eruo, ọ ga-anata ụgwọ ọrụ ya nʼuju,
ọzọ, alaka ya ga-akpọnwụ 33Ọ ga-adị ka osisi vaịnị nke mkpụrụ ya dapụsịrị na-achaghị acha,
dịka osisi oliv nke akwụkwọ ya kpọnwụrụ akpọnwụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.