Job 15:32
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Tụpụ oge ya eruo, ọ ga-anata ụgwọ ọrụ ya nʼuju, ọzọ, alaka ya ga-akpọnwụ
Job 15:32 in English
Job 15:32 · Berean Standard Bible
It will be paid in full before his time, and his branch will not flourish.
Context
30Ọ gaghị agbanarị ọchịchịrị,
ire ọkụ ga-eme ka ome ya kpọnwụọ,
iku ume nke ọnụ Chineke ga-ebufu ya. 31Ka onye dị otu a hapụ ịghọgbu onwe ya site nʼịtụkwasị uche nʼihe efu,
nʼihi na ọ dịghị ụgwọ ọrụ ọbụla ọ ga-enweta. 32Tụpụ oge ya eruo, ọ ga-anata ụgwọ ọrụ ya nʼuju,
ọzọ, alaka ya ga-akpọnwụ 33Ọ ga-adị ka osisi vaịnị nke mkpụrụ ya dapụsịrị na-achaghị acha,
dịka osisi oliv nke akwụkwọ ya kpọnwụrụ akpọnwụ. 34Nʼihi na ndị na-amaghị Chineke ga-adị ka nwanyị aga,
ọkụ ga-erepịa ụlọ ikwu niile nke ndị hụrụ iri ngarị nʼanya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.