Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Tụpụ oge ya eruo, ọ ga-anata ụgwọ ọrụ ya nʼuju, ọzọ, alaka ya ga-akpọnwụ

Job 15:32 in English

Job 15:32 · Berean Standard Bible

It will be paid in full before his time, and his branch will not flourish.

Context

30Ọ gaghị agbanarị ọchịchịrị, ire ọkụ ga-eme ka ome ya kpọnwụọ, iku ume nke ọnụ Chineke ga-ebufu ya. 31Ka onye dị otu a hapụ ịghọgbu onwe ya site nʼịtụkwasị uche nʼihe efu, nʼihi na ọ dịghị ụgwọ ọrụ ọbụla ọ ga-enweta. 32Tụpụ oge ya eruo, ọ ga-anata ụgwọ ọrụ ya nʼuju, ọzọ, alaka ya ga-akpọnwụ 33Ọ ga-adị ka osisi vaịnị nke mkpụrụ ya dapụsịrị na-achaghị acha, dịka osisi oliv nke akwụkwọ ya kpọnwụrụ akpọnwụ. 34Nʼihi na ndị na-amaghị Chineke ga-adị ka nwanyị aga, ọkụ ga-erepịa ụlọ ikwu niile nke ndị hụrụ iri ngarị nʼanya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.