Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Gịnị mere obi gị ji duhie gị, gịnị mekwara anya gị abụọ ji chagharịa,

Job 15:12 in English

Job 15:12 · Berean Standard Bible

Why has your heart carried you away, and why do your eyes flash,*

Context

10Ndịisi awọ na ndị kara nka nọ nʼetiti anyị, ndị ikom mere agadi karịa nna mụrụ gị. 11Ọ ga-abụ na nkasiobi Chineke bụrụ gị ihe nta, ka ọ bụ okwu dị nro nke ọ gwara gị? 12Gịnị mere obi gị ji duhie gị, gịnị mekwara anya gị abụọ ji chagharịa, 13nke mere iwe gị jiri dị ọkụ megide Chineke, meekwa ka okwu ọjọọ ndị a niile si nʼọnụ gị pụta? 14“Gịnị ka mmadụ efu bụ, ọ ga-eji dị ọcha nʼobi, gịnị ka mmadụ nwanyị mụrụ bụ, na ha nwere ike ị bụ ndị ezi omume?

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.