Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

ọ ga-esi aṅaa tụkwasị mmadụ efu onye rụrụ arụ obi, bụ onye na-aṅụ ajọ omume dịka mmiri.

Job 15:16 in English

Job 15:16 · Berean Standard Bible

how much less man, who is vile and corrupt, who drinks injustice like water?

Context

14“Gịnị ka mmadụ efu bụ, ọ ga-eji dị ọcha nʼobi, gịnị ka mmadụ nwanyị mụrụ bụ, na ha nwere ike ị bụ ndị ezi omume? 15Ọ bụrụ na Chineke atụkwasịghị ndị nsọ ya obi, ọ bụrụkwa na eluigwe adịghị ọcha nʼanya ya, 16ọ ga-esi aṅaa tụkwasị mmadụ efu onye rụrụ arụ obi, bụ onye na-aṅụ ajọ omume dịka mmiri. 17“Gee m ntị ka m kọwaara gị; kwerekwa ka m gwa gị ihe m hụrụ, 18bụ ihe ndị amamihe kwuru, ndị na-ezobeghị ihe ha natara nʼaka nna nna ha,

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.