Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Ọ bụ ezie na abụba kpuchiri ihu ya, abụba nke dị nʼukwu ya na-eme ka anụ ahụ nupụtakwa,

Job 15:27 in English

Job 15:27 · Berean Standard Bible

Though his face is covered with fat and his waistline bulges with flesh,

Context

25Nʼihi na ọ na-atụ Chineke aka nʼihu, dokwaa onwe ya imegide Onye pụrụ ime ihe niile. 26O ji ikwesi olu ike, dịka ọta siri ike, na-emegide Chineke. 27“Ọ bụ ezie na abụba kpuchiri ihu ya, abụba nke dị nʼukwu ya na-eme ka anụ ahụ nupụtakwa, 28ọ ga-ebi nʼobodo e bibiri ebibi, nʼụlọ nke mmadụ na-ekwesighị ibi nʼime ha, ụlọ nke na-adakasị adakasị. 29Ma ọ gaghị aga nʼihu ị bụ ọgaranya, akụ ya agaghị adịgidekwa. Ihe o nwere agakwaghị agbasapụ nʼala niile ahụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.