Job 15:19
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
bụ ndị e nyefere ala ndị a nʼaka ha mgbe ọ dịghị onye ọbịa gabigara nʼetiti ha.
Job 15:19 in English
Job 15:19 · Berean Standard Bible
to whom alone the land was given when no foreigner passed among them.
Context
17“Gee m ntị ka m kọwaara gị;
kwerekwa ka m gwa gị ihe m hụrụ, 18bụ ihe ndị amamihe kwuru,
ndị na-ezobeghị ihe ha natara nʼaka nna nna ha, 19bụ ndị e nyefere ala ndị a nʼaka ha
mgbe ọ dịghị onye ọbịa gabigara nʼetiti ha. 20Ụbọchị ndụ ya niile, onye ajọ omume na-ata ahụhụ mmekpa ahụ,
bụ nke e debere ogologo afọ nye nwoke ahụ na-eme ihe ike. 21Ụzụ na-eweta oke egwu na-eju ya ntị,
mgbe ọ dị ka ihe niile na-aga nke ọma, ndị na-apụnara mmadụ ihe na-abịakwasị ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.