Job 19:20
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Abụ m naanị ọkpụkpụ ọkpụkpụ; ihe m ji gbanarị ọnwụ adịghị ukwuu.
Job 19:20 in English
Job 19:20 · Berean Standard Bible
My skin and flesh cling to my bones; I have escaped by the skin of my teeth.
Context
18Ọ bụladị ụmụntakịrị nwoke na-akwa m emo;
ha na-ejikwa m eme ihe ọchị mgbe ọbụla m pụtara. 19Ndị ahụ m kpọrọ ndị enyi ọma m na-ele m anya dịka m bụ ihe arụ;
ndị ahụ niile m hụrụ nʼanya echigharịakwala megide m 20Abụ m naanị ọkpụkpụ ọkpụkpụ;
ihe m ji gbanarị ọnwụ adịghị ukwuu. 21“Meerenụ m ebere, ndị enyi m, meerenụ m ebere,
nʼihi na aka Chineke na-emegide m. 22Gịnị mere unu ji achụ m dịka Chineke si achụ m?
Ọ ga-abụ na ahụhụ m ejubeghị unu afọ?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.