Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

O yipụla m ugwu m, wepụkwa okpueze m kpu nʼisi.

Job 19:9 in English

Job 19:9 · Berean Standard Bible

He has stripped me of my honor and removed the crown from my head.

Context

7“Ọ bụ ezie na m na-eti mkpu akwa sị: ‘A na-emejọ m.’ Ma ọ dịghị ọsịsa m na-anata; ọ bụ ezie na m na-eti mkpu ka e nyere m aka ma ikpe ziri ezi adịghị. 8Ọ nọchiela ụzọ m ka m ghara ịgafe; o jirila ọchịchịrị kpuchie ụzọ m. 9O yipụla m ugwu m, wepụkwa okpueze m kpu nʼisi. 10Ọ na-eti m ihe otiti nʼakụkụ niile, ruo mgbe m gabigara; ọ na-ehopu olileanya m dịka osisi. 11Iwe ya dị ọkụ megide m; ọ na-agụnyekwa m dịka onye iro ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.