Proverbs 19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1Ọ ka mma ịbụ ogbenye onye kwesiri ntụkwasị obi
karịa ịbụ onye nzuzu na-ekwu okwu ụgha mgbe niile. 2Arịrịọ nke na-enweghị ihe ọmụma adịghị mma
otu a kwa onye ụkwụ ya na-eme ngwa na-ejehie ụzọ. 3Enweghị uche nke mmadụ na-eduba ha nʼọghọm,
ma obi ha na-ewe iwe dị ukwuu megide Onyenwe anyị. 4Onye nwere ego na-enwe ọtụtụ ndị enyi,
ma ọ na-ara ahụ ka ndị enyi onye ogbenye nọgide. 5Onye na-agba ama ụgha ga-ata ahụhụ,
ụzọ onye na-ekupụ ụgha dịka ume ka a ga-achọpụtakwa. 6Ọtụtụ mmadụ na-achọ ihuọma nʼebe onye na-achị achị nọ,
otu a kwa, mmadụ niile na-agbalị ịbụ enyi onye na-agbasa aka ya na-enye onyinye. 7Ebe ọ bụ na ụmụnne onye ogbenye na-akpọ ya asị,
gịnịkwa ka ndị enyi ya ga-eme?
Mgbalị ya niile ịrịọ ha arịrịọ
ezughị ime ka ha nọgide. 8Onye na-enweta amamihe hụrụ ndụ nʼanya,
onye na-edebekwa nghọta na-enweta ọganihu. 9Onyeama ụgha aghaghị ịta ahụhụ,
onye ọbụla na-ekwupụ okwu ụgha dịka mmiri ga-ala nʼiyi. 10Onye nzuzu ekwesighị ibi dịka ọgaranya;
ohu ekwesịkwaghị ịchị ụmụ eze. 11Ezi uche mmadụ nwere na-amụpụta ndidi;
ọ bụkwa nkwanye ugwu nye onye nʼadịghị agụ mkparị a na-akparị ya. 12Iwe eze dị ka mbigbọ nke ọdụm.
Ma obi ụtọ ya dị ka igirigi nʼelu ahịhịa ndụ. 13Nwa nzuzu bụ ịla nʼiyi nke nna,
nwunye na-ese okwu dị ka mmiri ọtụtụ na-atụ kpọm, kpọm,
mgbe niile nʼelu ụlọ puru epu. 14Ụlọ dị iche iche na akụ bụ ihe nketa a na-anata nʼaka ndị nne na nna,
ma nwunye nwere uche na nghọta na-esite naanị nʼaka Onyenwe anyị. 15Umengwụ na-akpata oke ịrahụ ụra,
onye ọfọ ogori ka agụụ na-agụ. 16Onye na-edebe iwu Chineke na-enweta ndụ,
ma onye na-akpọ ya asị na-anwụ. 17Onye ọbụla na-egosi ndị ogbenye obi ebere na-ebinye Onyenwe anyị ihe,
ọ ga-akwụghachi ha nʼihi ihe ọma ha mere. 18Dọọ nwa gị aka na ntị mgbe ọ ka dị na nwantakịrị nʼihi na oge ahụ ka olileanya dị.
Ma i meghị otu a, ọ bụ ndụ ya ka ị na-emebi. 19Onye oke iwe ga-anata nra so ya,
nʼihi na ọ bụrụ na ị napụta ya, ị ga-anapụtakwa ya ọzọ. 20Gee ntị na ndụmọdụ a na-enye gị, nabata ịdọ aka na ntị.
Nʼikpeazụ, ị ga-abụ onye maara ihe. 21Ọtụtụ atụmatụ dị nʼobi mmadụ;
maọbụ uche Onyenwe anyị ga-emezu. 22Obi ebere mmadụ na-eme ka a na-achọsi ya ike.
Ọ ka mma ịbụ ogbenye karịa ịbụ mmadụ nke eziokwu ọbụla na-adịghị nʼọnụ ya. 23Ịtụ egwu Onyenwe anyị na-eweta ndụ na ọṅụ,
na nchebe site nʼihe mmerụ ahụ. 24Onye umengwụ na-amanye aka nʼefere nri,
ọ gaghị eweghachi ya ọ bụladị tinye nʼọnụ ya. 25Tie onye na-akwa emo ihe, onye na-enweghị uche ga-aghọ onye nwere ezi uche,
baara onye nwere nghọta mba, ha ga-enweta ihe ọmụma. 26Ọ bụ nwa ahụ na-eweta ihere ga-ezu nne na nna ya ohi,
maọbụ chụpụ ha site nʼụlọ ya. 27Nwa m ọ bụrụ na ị hapụ ige ntị na ntụziaka m,
ị ga-esi nʼokwu ihe ọmụma kpafuo. 28Onyeama ụgha na-akwa ikpe ziri ezi emo.
Ọnụ nke onye ajọ omume na-eloda ajọ ihe. 29Ndị na-akwa emo na ndị nzuzu ga-ata ahụhụ;
a ga-etikwa ha ihe.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.