Ilu 19:14
Proverbs 19:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ụlọ dị iche iche na akụ bụ ihe nketa a na-anata nʼaka ndị nne na nna, ma nwunye nwere uche na nghọta na-esite naanị nʼaka Onyenwe anyị.
Proverbs 19:14 in English
Proverbs 19:14 · Berean Standard Bible
Houses and wealth are inherited from fathers, but a prudent wife is from the LORD.
Context
12Iwe eze dị ka mbigbọ nke ọdụm.
Ma obi ụtọ ya dị ka igirigi nʼelu ahịhịa ndụ. 13Nwa nzuzu bụ ịla nʼiyi nke nna,
nwunye na-ese okwu dị ka mmiri ọtụtụ na-atụ kpọm, kpọm,
mgbe niile nʼelu ụlọ puru epu. 14Ụlọ dị iche iche na akụ bụ ihe nketa a na-anata nʼaka ndị nne na nna,
ma nwunye nwere uche na nghọta na-esite naanị nʼaka Onyenwe anyị. 15Umengwụ na-akpata oke ịrahụ ụra,
onye ọfọ ogori ka agụụ na-agụ. 16Onye na-edebe iwu Chineke na-enweta ndụ,
ma onye na-akpọ ya asị na-anwụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.