Ilu 19:16
Proverbs 19:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye na-edebe iwu Chineke na-enweta ndụ, ma onye na-akpọ ya asị na-anwụ.
Proverbs 19:16 in English
Proverbs 19:16 · Berean Standard Bible
He who keeps a commandment preserves his soul, but he who is careless in his ways will die.
Context
14Ụlọ dị iche iche na akụ bụ ihe nketa a na-anata nʼaka ndị nne na nna,
ma nwunye nwere uche na nghọta na-esite naanị nʼaka Onyenwe anyị. 15Umengwụ na-akpata oke ịrahụ ụra,
onye ọfọ ogori ka agụụ na-agụ. 16Onye na-edebe iwu Chineke na-enweta ndụ,
ma onye na-akpọ ya asị na-anwụ. 17Onye ọbụla na-egosi ndị ogbenye obi ebere na-ebinye Onyenwe anyị ihe,
ọ ga-akwụghachi ha nʼihi ihe ọma ha mere. 18Dọọ nwa gị aka na ntị mgbe ọ ka dị na nwantakịrị nʼihi na oge ahụ ka olileanya dị.
Ma i meghị otu a, ọ bụ ndụ ya ka ị na-emebi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.