Ilu 19:17
Proverbs 19:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye ọbụla na-egosi ndị ogbenye obi ebere na-ebinye Onyenwe anyị ihe, ọ ga-akwụghachi ha nʼihi ihe ọma ha mere.
Proverbs 19:17 in English
Proverbs 19:17 · Berean Standard Bible
Kindness to the poor is a loan to the LORD, and He will repay the lender.
Context
15Umengwụ na-akpata oke ịrahụ ụra,
onye ọfọ ogori ka agụụ na-agụ. 16Onye na-edebe iwu Chineke na-enweta ndụ,
ma onye na-akpọ ya asị na-anwụ. 17Onye ọbụla na-egosi ndị ogbenye obi ebere na-ebinye Onyenwe anyị ihe,
ọ ga-akwụghachi ha nʼihi ihe ọma ha mere. 18Dọọ nwa gị aka na ntị mgbe ọ ka dị na nwantakịrị nʼihi na oge ahụ ka olileanya dị.
Ma i meghị otu a, ọ bụ ndụ ya ka ị na-emebi. 19Onye oke iwe ga-anata nra so ya,
nʼihi na ọ bụrụ na ị napụta ya, ị ga-anapụtakwa ya ọzọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.