Ilu 19:15
Proverbs 19:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Umengwụ na-akpata oke ịrahụ ụra, onye ọfọ ogori ka agụụ na-agụ.
Proverbs 19:15 in English
Proverbs 19:15 · Berean Standard Bible
Laziness brings on deep sleep, and an idle soul will suffer hunger.
Context
13Nwa nzuzu bụ ịla nʼiyi nke nna,
nwunye na-ese okwu dị ka mmiri ọtụtụ na-atụ kpọm, kpọm,
mgbe niile nʼelu ụlọ puru epu. 14Ụlọ dị iche iche na akụ bụ ihe nketa a na-anata nʼaka ndị nne na nna,
ma nwunye nwere uche na nghọta na-esite naanị nʼaka Onyenwe anyị. 15Umengwụ na-akpata oke ịrahụ ụra,
onye ọfọ ogori ka agụụ na-agụ. 16Onye na-edebe iwu Chineke na-enweta ndụ,
ma onye na-akpọ ya asị na-anwụ. 17Onye ọbụla na-egosi ndị ogbenye obi ebere na-ebinye Onyenwe anyị ihe,
ọ ga-akwụghachi ha nʼihi ihe ọma ha mere.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.