Ilu 19:24
Proverbs 19:24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye umengwụ na-amanye aka nʼefere nri, ọ gaghị eweghachi ya ọ bụladị tinye nʼọnụ ya.
Proverbs 19:24 in English
Proverbs 19:24 · Berean Standard Bible
The slacker buries his hand in the dish; he will not even bring it back to his mouth.
Context
22Obi ebere mmadụ na-eme ka a na-achọsi ya ike.
Ọ ka mma ịbụ ogbenye karịa ịbụ mmadụ nke eziokwu ọbụla na-adịghị nʼọnụ ya. 23Ịtụ egwu Onyenwe anyị na-eweta ndụ na ọṅụ,
na nchebe site nʼihe mmerụ ahụ. 24Onye umengwụ na-amanye aka nʼefere nri,
ọ gaghị eweghachi ya ọ bụladị tinye nʼọnụ ya. 25Tie onye na-akwa emo ihe, onye na-enweghị uche ga-aghọ onye nwere ezi uche,
baara onye nwere nghọta mba, ha ga-enweta ihe ọmụma. 26Ọ bụ nwa ahụ na-eweta ihere ga-ezu nne na nna ya ohi,
maọbụ chụpụ ha site nʼụlọ ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.