Ilu 19:3
Proverbs 19:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Enweghị uche nke mmadụ na-eduba ha nʼọghọm, ma obi ha na-ewe iwe dị ukwuu megide Onyenwe anyị.
Proverbs 19:3 in English
Proverbs 19:3 · Berean Standard Bible
A man’s own folly subverts his way, yet his heart rages against the LORD.
Context
1Ọ ka mma ịbụ ogbenye onye kwesiri ntụkwasị obi
karịa ịbụ onye nzuzu na-ekwu okwu ụgha mgbe niile. 2Arịrịọ nke na-enweghị ihe ọmụma adịghị mma
otu a kwa onye ụkwụ ya na-eme ngwa na-ejehie ụzọ. 3Enweghị uche nke mmadụ na-eduba ha nʼọghọm,
ma obi ha na-ewe iwe dị ukwuu megide Onyenwe anyị. 4Onye nwere ego na-enwe ọtụtụ ndị enyi,
ma ọ na-ara ahụ ka ndị enyi onye ogbenye nọgide. 5Onye na-agba ama ụgha ga-ata ahụhụ,
ụzọ onye na-ekupụ ụgha dịka ume ka a ga-achọpụtakwa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.