Ilu 19:5
Proverbs 19:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye na-agba ama ụgha ga-ata ahụhụ, ụzọ onye na-ekupụ ụgha dịka ume ka a ga-achọpụtakwa.
Proverbs 19:5 in English
Proverbs 19:5 · Berean Standard Bible
A false witness will not go unpunished, and one who utters lies will not escape.
Context
3Enweghị uche nke mmadụ na-eduba ha nʼọghọm,
ma obi ha na-ewe iwe dị ukwuu megide Onyenwe anyị. 4Onye nwere ego na-enwe ọtụtụ ndị enyi,
ma ọ na-ara ahụ ka ndị enyi onye ogbenye nọgide. 5Onye na-agba ama ụgha ga-ata ahụhụ,
ụzọ onye na-ekupụ ụgha dịka ume ka a ga-achọpụtakwa. 6Ọtụtụ mmadụ na-achọ ihuọma nʼebe onye na-achị achị nọ,
otu a kwa, mmadụ niile na-agbalị ịbụ enyi onye na-agbasa aka ya na-enye onyinye. 7Ebe ọ bụ na ụmụnne onye ogbenye na-akpọ ya asị,
gịnịkwa ka ndị enyi ya ga-eme?
Mgbalị ya niile ịrịọ ha arịrịọ
ezughị ime ka ha nọgide.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.