Ilu 19:7
Proverbs 19:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ebe ọ bụ na ụmụnne onye ogbenye na-akpọ ya asị, gịnịkwa ka ndị enyi ya ga-eme? Mgbalị ya niile ịrịọ ha arịrịọ ezughị ime ka ha nọgide.
Proverbs 19:7 in English
Proverbs 19:7 · Berean Standard Bible
All the brothers of a poor man hate him— how much more do his friends avoid him! He may pursue them with pleading, but they are nowhere to be found.
Context
5Onye na-agba ama ụgha ga-ata ahụhụ,
ụzọ onye na-ekupụ ụgha dịka ume ka a ga-achọpụtakwa. 6Ọtụtụ mmadụ na-achọ ihuọma nʼebe onye na-achị achị nọ,
otu a kwa, mmadụ niile na-agbalị ịbụ enyi onye na-agbasa aka ya na-enye onyinye. 7Ebe ọ bụ na ụmụnne onye ogbenye na-akpọ ya asị,
gịnịkwa ka ndị enyi ya ga-eme?
Mgbalị ya niile ịrịọ ha arịrịọ
ezughị ime ka ha nọgide. 8Onye na-enweta amamihe hụrụ ndụ nʼanya,
onye na-edebekwa nghọta na-enweta ọganihu. 9Onyeama ụgha aghaghị ịta ahụhụ,
onye ọbụla na-ekwupụ okwu ụgha dịka mmiri ga-ala nʼiyi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.