Ilu 19:27
Proverbs 19:27 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nwa m ọ bụrụ na ị hapụ ige ntị na ntụziaka m, ị ga-esi nʼokwu ihe ọmụma kpafuo.
Proverbs 19:27 in English
Proverbs 19:27 · Berean Standard Bible
If you cease to hear instruction, my son, you will stray from the words of knowledge.
Context
25Tie onye na-akwa emo ihe, onye na-enweghị uche ga-aghọ onye nwere ezi uche,
baara onye nwere nghọta mba, ha ga-enweta ihe ọmụma. 26Ọ bụ nwa ahụ na-eweta ihere ga-ezu nne na nna ya ohi,
maọbụ chụpụ ha site nʼụlọ ya. 27Nwa m ọ bụrụ na ị hapụ ige ntị na ntụziaka m,
ị ga-esi nʼokwu ihe ọmụma kpafuo. 28Onyeama ụgha na-akwa ikpe ziri ezi emo.
Ọnụ nke onye ajọ omume na-eloda ajọ ihe. 29Ndị na-akwa emo na ndị nzuzu ga-ata ahụhụ;
a ga-etikwa ha ihe.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.