Ilu 19:11
Proverbs 19:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ezi uche mmadụ nwere na-amụpụta ndidi; ọ bụkwa nkwanye ugwu nye onye nʼadịghị agụ mkparị a na-akparị ya.
Proverbs 19:11 in English
Proverbs 19:11 · Berean Standard Bible
A man’s insight gives him patience, and his virtue is to overlook an offense.
Context
9Onyeama ụgha aghaghị ịta ahụhụ,
onye ọbụla na-ekwupụ okwu ụgha dịka mmiri ga-ala nʼiyi. 10Onye nzuzu ekwesighị ibi dịka ọgaranya;
ohu ekwesịkwaghị ịchị ụmụ eze. 11Ezi uche mmadụ nwere na-amụpụta ndidi;
ọ bụkwa nkwanye ugwu nye onye nʼadịghị agụ mkparị a na-akparị ya. 12Iwe eze dị ka mbigbọ nke ọdụm.
Ma obi ụtọ ya dị ka igirigi nʼelu ahịhịa ndụ. 13Nwa nzuzu bụ ịla nʼiyi nke nna,
nwunye na-ese okwu dị ka mmiri ọtụtụ na-atụ kpọm, kpọm,
mgbe niile nʼelu ụlọ puru epu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.