Ilu 19:10
Proverbs 19:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye nzuzu ekwesighị ibi dịka ọgaranya; ohu ekwesịkwaghị ịchị ụmụ eze.
Proverbs 19:10 in English
Proverbs 19:10 · Berean Standard Bible
Luxury is unseemly for a fool— how much worse for a slave to rule over princes!
Context
8Onye na-enweta amamihe hụrụ ndụ nʼanya,
onye na-edebekwa nghọta na-enweta ọganihu. 9Onyeama ụgha aghaghị ịta ahụhụ,
onye ọbụla na-ekwupụ okwu ụgha dịka mmiri ga-ala nʼiyi. 10Onye nzuzu ekwesighị ibi dịka ọgaranya;
ohu ekwesịkwaghị ịchị ụmụ eze. 11Ezi uche mmadụ nwere na-amụpụta ndidi;
ọ bụkwa nkwanye ugwu nye onye nʼadịghị agụ mkparị a na-akparị ya. 12Iwe eze dị ka mbigbọ nke ọdụm.
Ma obi ụtọ ya dị ka igirigi nʼelu ahịhịa ndụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.