Proverbs 20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1Mmanya bụ onye na-akwa emo. Onye mkpọtụ ka ihe ọṅụṅụ na-aba nʼanya bụ.
Onye ọbụla kwere ka ha duhie ya bụ onye nzuzu. 2Ọnụma eze na-emenye oke ụjọ nʼahụ dịka mbigbọ nke ọdụm;
ndị na-akpasu ya iwe ga-atụfu ndụ ha. 3Ọ bụ ihe nsọpụrụ nye onye na-ezere okwu na ụka,
ma onye nzuzu ọbụla na-eme ngwa ise okwu. 4Onye umengwụ adịghị arụ ọrụ ubi nʼoge ya.
Nʼoge owuwe ihe ubi ọ pụghị ịchọta ihe oriri. 5Nzube niile nke dị mmadụ nʼobi bụ mmiri dị omimi,
ma onye nwere nghọta na-adọpụta ha. 6Ọtụtụ mmadụ na-asị na ha nwere ịhụnanya na-adịghị agharịpụ,
ma onye kwesiri ntụkwasị obi, onye pụrụ ịchọta ya? 7Onye ezi omume nke na-ejegharị nʼizuoke,
ndị ihe na-agara nke ọma ka ụmụ ga-anọchi ya ga-abụ. 8Mgbe eze na-anọkwasị nʼocheeze ya ikpe ikpe,
ọ na-eji anya ya abụọ afụchapụ ihe ọjọọ niile. 9Onye pụrụ ị sị, “Emeela m ka obi m dị ọcha;
Abụ m onye dị ọcha, mmehie adịghịkwa nʼime m?” 10Ihe ọtụtụ aghụghọ na ihe ọtụtụ nghọgbu,
ha niile bụ ihe arụ nʼihu Onyenwe anyị. 11Ọbụladị ụmụntakịrị ka a na-amata site nʼomume ha niile,
nke a ọ pụtara nʼomume ha dị ọcha nʼezie a, bụrụkwa ihe ziri ezi? 12Ntị nke na-anụ ihe na anya nke na-ahụ ụzọ,
ọ bụ Onyenwe anyị mere ha abụọ. 13Ahụla ịrahụ ụra nʼanya, ka ị ghara ịghọ onye ụkpa.
Bilie, mụrụ anya, rụsie ọrụ ike, ka i nweekwa ihe oriri. 14“Lee, ihe a jọrọ njọ, ọ baghị uru,” ka onye na-azụ ahịa na-asị,
ma mgbe ọ pụrụ ọ na-anya isi nʼihi ihe ọ zụtara. 15Ọlaedo dị, na ọtụtụ rubi nʼebe ọ bara ụba,
ma egbugbere ọnụ nke na-ekwupụta ihe ọmụma bụ ọla dị oke ọnụahịa. 16Chiri uwe onye ahụ naara onye mba ọzọ nʼaka mbe.
Jichiekwa ihe mbe ahụ o nyere nʼihi onye mba ọzọ ọ nara na mbe. 17Nri e nwetara nʼụzọ aghụghọ na-atọ mmadụ ụtọ.
Ma nʼikpeazụ aja ga-eju ya ọnụ. 18Buru ụzọ nata ndụmọdụ tupu i mee ihe ọbụla ị chọrọ ime;
ebula agha ma i bubeghị ụzọ pịa ọpịpịa. 19Agwala onye na-akpa asịrị ihe nzuzo gị,
nʼihi na ọ ga-akụ ya nʼekwe nye ụwa niile. 20Oriọna onye ahụ na-akọcha nne ya na nna ya
ka Chineke na-afụnyụ. 21Ihe nketa nke anatara nʼoke ọsịịsọ,
agaghị agọzi ya nʼikpeazụ. 22A sịkwala, “Aga m akwụghachi gị nʼihi ihe ọjọọ a.”
Chere Onyenwe anyị, ọ ga-abọrọ gị ọbọ. 23Onyenwe anyị kpọrọ ihe ọtụtụ gbara iche iche asị,
ihe ọtụtụ aghụghọ adịghị atọ ya ụtọ. 24Onyenwe anyị na-eduzi nzọ ụkwụ niile nke mmadụ.
Olee otu onye ọbụla ga-esi ghọta ụzọ ha? 25Ime ngwangwa* doo ihe nsọ, bụ ịma nʼọnya
ma mesie tụgharịwa uche banyere imezu nkwa ahụ. 26Eze maara ihe na-afụchapụ ndị ajọ omume,
ọ na-eji wịịlu ịfụcha mkpụrụ gaa nʼelu ha. 27Akọnuche mmadụ bụ ọkụ Onyenwe anyị ji enyocha mmụọ ya,
ọ na-egwupụta ala ala obi ya, igosi anyị ihe anyị bụ. 28Ịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi na-echebe eze,
site nʼịhụnanya ka ocheeze ya na-eguzo chịm. 29Ugwu a na-akwanyere ụmụ okorobịa bụ nʼihi ịdị ike ha,
ma isi awọ bụ nsọpụrụ ndị okenye. 30Ọkpọ na mmerụ ahụ na-ehichapụ ihe ọjọọ,
ụtarị na-asachapụ ime ime nke ahụ mmadụ.
20:25 Ya bụ mgbe mmadụ na-echeghị uche mee nke a.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.