Proverbs 21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1Iyi dị iche iche nke jupụtara na mmiri ka obi eze bụ nʼaka Onyenwe anyị,
nke ọ na-ahazi nʼụzọ ọbụla dị ya mma. 2Ọrụ niile bụ ihe ziri ezi nʼanya onye na-arụ ya,
ma Onyenwe anyị bụ onye na-eleba anya nʼechiche obi anyị niile. 3Ime ezi omume na ihe ziri ezi
ka Onyenwe anyị na-anabata karịa ịchụ aja. 4Nganga na mpako na agụụ ihe ọjọọ
nke bụ ọrụ ndị ajọ omume, bụ mmehie. 5Echiche niile nke onye na-arụsị ọrụ ike na-eweta uru,
dịka echiche onye ome ngwangwa na-enweta naanị ụkọ. 6Uru niile enwetara nʼụzọ na-ezighị ezi adịghị adịgide,
ha bụ nkuume ifufe na-efesa, ndị na-achọ ya na-achọ ọnwụ. 7Nʼihi na ndị na-emebi iwu anaghị eme ihe ọma,
ihe ọjọọ ha na-eme na-alaghachi laa ha nʼiyi. 8Ụzọ onye na-emebi iwu bụ ihe gbagọrọ agbagọ,
ma omume onye aka ya dị ọcha ziri ezi. 9Ọ ka mma ibi nʼotu akụkụ elu ụlọ
karịa ibinyere nwanyị na-ese okwu. 10Ihe na-atọ onye ọjọọ ụtọ bụ imerụ ndị ọzọ ahụ;
ọ maghị imere mmadụ ibe ya ebere. 11Mgbe a na-ata onye na-akwa emo ahụhụ, onye na-enweghị uche na-enweta amamihe,
ma mgbe a na-akụziri onye maara ihe ihe ọ na-enweta ihe ọmụma. 12Onye ezi omume na-amụta ihe site nʼile ụlọ onye ajọ omume anya
na-emekwa ka ndị ajọ omume laa nʼiyi. 13Onye na-adịghị ege ntị na mkpu onye ogbenye,
ya onwe ya ga-akpọkwa mkpu ma agaghị aza ya. 14Onyinye enyere na nzuzo na-eme ka iwe dajụọ,
otu a kwa, ngarị ezonyere nʼime uwe na-eme ka oke ọnụma dajụọ. 15Onye ezi omume na-aṅụrị ọṅụ mgbe e kpere ikpe ziri ezi,
ma bụrụ ihe oke egwu dịrị ndị na-eme ajọ ihe. 16Onye ọbụla si nʼụzọ nghọta wezuga onwe ya
ga-eso nʼotu ndị nwụrụ anwụ. 17Nwoke hụrụ ibi ndụ nganga nʼanya na-ada ụkpa;
ịṅụ mmanya na oke oriri abụghị ụzọ esi akpata akụ. 18Onye ajọ omume ga-abụ ihe mgbapụta maka onye ezi omume,
onye aghụghọ ga-abụkwa ihe mgbapụta maka onye ndụ ya ziri ezi. 19Ọ ka mma ibi nʼọzara
karịa ibinyere nwanyị na-atamu ntamu na-esekwa okwu. 20Onye maara ihe na-edebe ezi ihe oriri na mmanụ oliv nʼụlọ ya,
ma onye nzuzu na-eloda ihe niile nʼọnụ ya. 21Onye na-achụso ezi omume na ịhụnanya
ga-achọta ndụ, na ugwu na ọganihu. 22Onye maara ihe nwere ike megide obodo ndị dike,
kwatuokwa ebe ewusiri ike nke ha tụkwasịrị obi ha. 23Onye na-echekwa ire ya na ọnụ ya
na-egbochiri onwe ya ọdachi. 24Onye nganga na onye mpako, onye na-akwa emo bụ aha ya.
Ọ na-eji oke nganga eme ihe niile. 25Oke ọchịchọ nke onye umengwụ na-ewetara ya ọnwụ
nʼihi na ọ jụrụ ịrụ ọrụ. 26Kwa ụbọchị ka ọ na-achọ inwe karịa,
ma onye ezi omume na-enye na-akpaghị oke. 27Chineke kpọrọ aja ndị na-emebi iwu asị,
nke ka nke, ma ọ bụrụ na ha na-enye onyinye a site na nzube ọjọọ. 28Onyeama ụgha ga-ala nʼiyi,
ma onye ọbụla na-ege ya ntị ka a ga-ebibi ruo ebighị ebi. 29Ndị ajọ omume na-ebi ndụ atụghị egwu,
ma ndị omume ha ziri ezi na-atụgharị uche nʼụzọ ha niile. 30O nweghị amamihe dị, o nweghị nghọta dị, o nwekwaghị atụmatụ ọbụla,
nke pụrụ iguzosi ike megide Onyenwe anyị. 31E nwere ike jikere ịnyịnya, kwadokwaa maka agha,
maọbụ naanị Onyenwe anyị na-enye mmeri.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.