Native Bible

Proverbs 21:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ime ezi omume na ihe ziri ezi ka Onyenwe anyị na-anabata karịa ịchụ aja.

Proverbs 21:3 in English

Proverbs 21:3 · Berean Standard Bible

To do righteousness and justice is more desirable to the LORD than sacrifice.

Context

1Iyi dị iche iche nke jupụtara na mmiri ka obi eze bụ nʼaka Onyenwe anyị, nke ọ na-ahazi nʼụzọ ọbụla dị ya mma. 2Ọrụ niile bụ ihe ziri ezi nʼanya onye na-arụ ya, ma Onyenwe anyị bụ onye na-eleba anya nʼechiche obi anyị niile. 3Ime ezi omume na ihe ziri ezi ka Onyenwe anyị na-anabata karịa ịchụ aja. 4Nganga na mpako na agụụ ihe ọjọọ nke bụ ọrụ ndị ajọ omume, bụ mmehie. 5Echiche niile nke onye na-arụsị ọrụ ike na-eweta uru, dịka echiche onye ome ngwangwa na-enweta naanị ụkọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.