Native Bible

Proverbs 21:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nganga na mpako na agụụ ihe ọjọọ nke bụ ọrụ ndị ajọ omume, bụ mmehie.

Proverbs 21:4 in English

Proverbs 21:4 · Berean Standard Bible

Haughty eyes and a proud heart— the guides of the wicked—are sin.

Context

2Ọrụ niile bụ ihe ziri ezi nʼanya onye na-arụ ya, ma Onyenwe anyị bụ onye na-eleba anya nʼechiche obi anyị niile. 3Ime ezi omume na ihe ziri ezi ka Onyenwe anyị na-anabata karịa ịchụ aja. 4Nganga na mpako na agụụ ihe ọjọọ nke bụ ọrụ ndị ajọ omume, bụ mmehie. 5Echiche niile nke onye na-arụsị ọrụ ike na-eweta uru, dịka echiche onye ome ngwangwa na-enweta naanị ụkọ. 6Uru niile enwetara nʼụzọ na-ezighị ezi adịghị adịgide, ha bụ nkuume ifufe na-efesa, ndị na-achọ ya na-achọ ọnwụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.