Native Bible

Proverbs 21:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Iyi dị iche iche nke jupụtara na mmiri ka obi eze bụ nʼaka Onyenwe anyị, nke ọ na-ahazi nʼụzọ ọbụla dị ya mma.

Proverbs 21:1 in English

Proverbs 21:1 · Berean Standard Bible

The king’s heart is a waterway in the hand of the LORD; He directs it where He pleases.

Context

1Iyi dị iche iche nke jupụtara na mmiri ka obi eze bụ nʼaka Onyenwe anyị, nke ọ na-ahazi nʼụzọ ọbụla dị ya mma. 2Ọrụ niile bụ ihe ziri ezi nʼanya onye na-arụ ya, ma Onyenwe anyị bụ onye na-eleba anya nʼechiche obi anyị niile. 3Ime ezi omume na ihe ziri ezi ka Onyenwe anyị na-anabata karịa ịchụ aja.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.