Proverbs 22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1Ihe nhọrọ dị ezi mma ka aha ọma bụ karịa ọtụtụ akụ,
ịnata amara* ihuọma ka mma karịa ọlaọcha na ọlaedo. 2Ma ogbenye ma ọgaranya bụ otu nʼihu Onyenwe anyị
onye kere ha niile. 3Onye nwere uche na-ahụ nsogbu nke na-abịa nʼihu ma zobe onwe ya,
ma onye na-enweghị uche anaghị ele anya, ọ na-adaba nʼime nsogbu ahụ taa ahụhụ so ya. 4Obi umeala bụ egwu Onyenwe anyị,
ụgwọ ọ na-akwụ bụ akụnụba, na nsọpụrụ na ndụ ogologo. 5Ogwu na igbudu dị nʼụzọ onye na-emebi iwu;
ma onye kpọrọ ndụ ya ihe na-asọ ya asọ. 6Kuziere nwantakịrị ka ọ họrọ ụzọ ziri ezi,*
mgbe o tolitere ọ ga-anọgide nʼime ya. 7Dịka ọgaranya si achị ogbenye,
otu a kwa ka onye na-ebi ego si bụrụ ohu onye na-ebinye ya ego. 8Onye na-agha ikpe na-ezighị ezi dịka mkpụrụ, ga-ewe ajọ ihe dịka ihe ubi,
mkpanaka nke ikike iwe ha ga-agbajikwa. 9Onye na-agbasapụ aka enye onyinye ga-abụ onye a gọziri agọzi,
nʼihi na ha na ekenyetụ ndị ogbenye nri. 10Chụpụ onye na-akwa emo, ise okwu ga-akwụsị,
e, ịlụ ọgụ na nlelị ga-akwụsịkwa. 11Onye na-ahụ ịdị ọcha nke obi nʼanya,
onye okwu ya jupụtara nʼamara ga-abụ enyi eze. 12Anya Onyenwe anyị na-echebe ihe ọmụma,
ma ọ na-emebi atụmatụ niile nke ndị aghụghọ. 13Onye umengwụ na-asị, “Ọdụm nọ nʼezi!
A ga-egbu m nʼama ọha mmadụ!” 14Ọnụ nwanyị na-akwa iko bụ oke olulu,
nwoke nọ nʼokpuru oke iwe Onyenwe anyị na-adaba nʼime ya. 15Obi ụmụntakịrị jupụtara nʼenweghị uche,
ma apịpịa ịdọ aka na ntị ga-achụpụ ya nʼebe dị anya. 16Onye na-achọ uru site nʼimegbu onye na-enweghị ike,
maọbụ onye na-enye ọgaranya onyinye ga-ebi nʼoke ụkọ. 17Lezie anya gee ntị nʼokwu niile nke ndị maara ihe,
tinye uche gị nʼihe m na-akụzi. 18Ọ dị ụtọ ma idebe ha nʼobi gị,
ma ha dịkwa nʼegbugbere ọnụ gị mgbe niile. 19Ọ bụ ka ntụkwasị obi gị dị nʼime Onyenwe anyị,
ya ka m na-akụziri gị taa, ọbụladị gị onwe gị. 20Ọ bụ na m edepụtabereghị gị iri ndụmọdụ atọ ndị a,
bụ okwu ndụmọdụ na ihe ọmụma? 21Ha na-ezi gị ihe bụ ikwesi ntụkwasị obi na ikwu eziokwu.
Mgbe ahụ ọ bụrụ na-ezie gị sị gị gaa chọta eziokwu
ị ga-eji ezi ọsịsa lọghachi. 22Emegbula ogbenye nʼihi na ọ bụ ogbenye.
Emegidekwala ya nʼụzọ ikpe. 23Nʼihi na Onyenwe anyị ga-ekwuchitere ha ọnụ ha
ma bibiekwa ndị na-emegide ha. 24Gị na onye na-ewe oke iwe abụla enyi,
gị na onye na-ewe iwe ọsịịsọ emekọkwala ihe, 25ma ọ bụghị ya, i nwere ike ịmụta ndụ ha,
si otu a tinye ndụ gị na nsogbu. 26Abụla onye otu nʼime ndị na-anara ndị mmadụ akaebe
maọbụ kwee nkwa ikwu ụgwọ onye ọzọ ji. 27Nʼihi na ọ bụrụ na i nweghị ego ị ga-eji kwụọ ụgwọ ahụ,
a ga-anapụ gị ọ bụladị ihe ndina gị. 28Ehigharịla oke ala e tinyere site na mgbe ochie.
Nke ndị nna ochie gị ha hiwere. 29Ị hụrụ mmadụ ahụ nke nwere ǹka nʼịrụ ọrụ ya nke ọma?
Ọ ga-eguzo nʼihu ndị eze,
ọ gaghị eguzo nʼihu ndị a na-amaghị aha ha.
22:1 Maọbụ, mmadụ inwe ugwu
22:6 Efe 6:4; 2Tm 3:15
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.