Native Bible

Proverbs 22:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onye na-agha ikpe na-ezighị ezi dịka mkpụrụ, ga-ewe ajọ ihe dịka ihe ubi, mkpanaka nke ikike iwe ha ga-agbajikwa.

Proverbs 22:8 in English

Proverbs 22:8 · Berean Standard Bible

He who sows injustice will reap disaster, and the rod of his fury will be destroyed.*

Context

6Kuziere nwantakịrị ka ọ họrọ ụzọ ziri ezi,* mgbe o tolitere ọ ga-anọgide nʼime ya. 7Dịka ọgaranya si achị ogbenye, otu a kwa ka onye na-ebi ego si bụrụ ohu onye na-ebinye ya ego. 8Onye na-agha ikpe na-ezighị ezi dịka mkpụrụ, ga-ewe ajọ ihe dịka ihe ubi, mkpanaka nke ikike iwe ha ga-agbajikwa. 9Onye na-agbasapụ aka enye onyinye ga-abụ onye a gọziri agọzi, nʼihi na ha na ekenyetụ ndị ogbenye nri. 10Chụpụ onye na-akwa emo, ise okwu ga-akwụsị, e, ịlụ ọgụ na nlelị ga-akwụsịkwa.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.