Native Bible

Proverbs 22:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Dịka ọgaranya si achị ogbenye, otu a kwa ka onye na-ebi ego si bụrụ ohu onye na-ebinye ya ego.

Proverbs 22:7 in English

Proverbs 22:7 · Berean Standard Bible

The rich rule over the poor, and the borrower is slave to the lender.

Context

5Ogwu na igbudu dị nʼụzọ onye na-emebi iwu; ma onye kpọrọ ndụ ya ihe na-asọ ya asọ. 6Kuziere nwantakịrị ka ọ họrọ ụzọ ziri ezi,* mgbe o tolitere ọ ga-anọgide nʼime ya. 7Dịka ọgaranya si achị ogbenye, otu a kwa ka onye na-ebi ego si bụrụ ohu onye na-ebinye ya ego. 8Onye na-agha ikpe na-ezighị ezi dịka mkpụrụ, ga-ewe ajọ ihe dịka ihe ubi, mkpanaka nke ikike iwe ha ga-agbajikwa. 9Onye na-agbasapụ aka enye onyinye ga-abụ onye a gọziri agọzi, nʼihi na ha na ekenyetụ ndị ogbenye nri.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.