Native Bible

Proverbs 22:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Kuziere nwantakịrị ka ọ họrọ ụzọ ziri ezi,* mgbe o tolitere ọ ga-anọgide nʼime ya.

Proverbs 22:6 in English

Proverbs 22:6 · Berean Standard Bible

Train up a child in the way he should go, and when he is old he will not depart from it.

Context

4Obi umeala bụ egwu Onyenwe anyị, ụgwọ ọ na-akwụ bụ akụnụba, na nsọpụrụ na ndụ ogologo. 5Ogwu na igbudu dị nʼụzọ onye na-emebi iwu; ma onye kpọrọ ndụ ya ihe na-asọ ya asọ. 6Kuziere nwantakịrị ka ọ họrọ ụzọ ziri ezi,* mgbe o tolitere ọ ga-anọgide nʼime ya. 7Dịka ọgaranya si achị ogbenye, otu a kwa ka onye na-ebi ego si bụrụ ohu onye na-ebinye ya ego. 8Onye na-agha ikpe na-ezighị ezi dịka mkpụrụ, ga-ewe ajọ ihe dịka ihe ubi, mkpanaka nke ikike iwe ha ga-agbajikwa.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.