Native Bible

Proverbs 22:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Abụla onye otu nʼime ndị na-anara ndị mmadụ akaebe maọbụ kwee nkwa ikwu ụgwọ onye ọzọ ji.

Proverbs 22:26 in English

Proverbs 22:26 · Berean Standard Bible

Do not be one who gives pledges, who puts up security for debts.

Context

24Gị na onye na-ewe oke iwe abụla enyi, gị na onye na-ewe iwe ọsịịsọ emekọkwala ihe, 25ma ọ bụghị ya, i nwere ike ịmụta ndụ ha, si otu a tinye ndụ gị na nsogbu. 26Abụla onye otu nʼime ndị na-anara ndị mmadụ akaebe maọbụ kwee nkwa ikwu ụgwọ onye ọzọ ji. 27Nʼihi na ọ bụrụ na i nweghị ego ị ga-eji kwụọ ụgwọ ahụ, a ga-anapụ gị ọ bụladị ihe ndina gị. 28Ehigharịla oke ala e tinyere site na mgbe ochie. Nke ndị nna ochie gị ha hiwere.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.