Ilu 22:16
Proverbs 22:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye na-achọ uru site nʼimegbu onye na-enweghị ike, maọbụ onye na-enye ọgaranya onyinye ga-ebi nʼoke ụkọ.
Proverbs 22:16 in English
Proverbs 22:16 · Berean Standard Bible
Oppressing the poor to enrich oneself or giving gifts to the rich will surely lead to poverty.
Context
14Ọnụ nwanyị na-akwa iko bụ oke olulu,
nwoke nọ nʼokpuru oke iwe Onyenwe anyị na-adaba nʼime ya. 15Obi ụmụntakịrị jupụtara nʼenweghị uche,
ma apịpịa ịdọ aka na ntị ga-achụpụ ya nʼebe dị anya. 16Onye na-achọ uru site nʼimegbu onye na-enweghị ike,
maọbụ onye na-enye ọgaranya onyinye ga-ebi nʼoke ụkọ. 17Lezie anya gee ntị nʼokwu niile nke ndị maara ihe,
tinye uche gị nʼihe m na-akụzi. 18Ọ dị ụtọ ma idebe ha nʼobi gị,
ma ha dịkwa nʼegbugbere ọnụ gị mgbe niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.