Native Bible

Proverbs 21:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ ka mma ibi nʼọzara karịa ibinyere nwanyị na-atamu ntamu na-esekwa okwu.

Proverbs 21:19 in English

Proverbs 21:19 · Berean Standard Bible

Better to live in the desert than with a contentious and ill-tempered wife.

Context

17Nwoke hụrụ ibi ndụ nganga nʼanya na-ada ụkpa; ịṅụ mmanya na oke oriri abụghị ụzọ esi akpata akụ. 18Onye ajọ omume ga-abụ ihe mgbapụta maka onye ezi omume, onye aghụghọ ga-abụkwa ihe mgbapụta maka onye ndụ ya ziri ezi. 19Ọ ka mma ibi nʼọzara karịa ibinyere nwanyị na-atamu ntamu na-esekwa okwu. 20Onye maara ihe na-edebe ezi ihe oriri na mmanụ oliv nʼụlọ ya, ma onye nzuzu na-eloda ihe niile nʼọnụ ya. 21Onye na-achụso ezi omume na ịhụnanya ga-achọta ndụ, na ugwu na ọganihu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.