Native Bible

Proverbs 21:25 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Oke ọchịchọ nke onye umengwụ na-ewetara ya ọnwụ nʼihi na ọ jụrụ ịrụ ọrụ.

Proverbs 21:25 in English

Proverbs 21:25 · Berean Standard Bible

The craving of the slacker kills him because his hands refuse to work.

Context

23Onye na-echekwa ire ya na ọnụ ya na-egbochiri onwe ya ọdachi. 24Onye nganga na onye mpako, onye na-akwa emo bụ aha ya. Ọ na-eji oke nganga eme ihe niile. 25Oke ọchịchọ nke onye umengwụ na-ewetara ya ọnwụ nʼihi na ọ jụrụ ịrụ ọrụ. 26Kwa ụbọchị ka ọ na-achọ inwe karịa, ma onye ezi omume na-enye na-akpaghị oke. 27Chineke kpọrọ aja ndị na-emebi iwu asị, nke ka nke, ma ọ bụrụ na ha na-enye onyinye a site na nzube ọjọọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.