Ilu 21:25
Proverbs 21:25 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Oke ọchịchọ nke onye umengwụ na-ewetara ya ọnwụ nʼihi na ọ jụrụ ịrụ ọrụ.
Proverbs 21:25 in English
Proverbs 21:25 · Berean Standard Bible
The craving of the slacker kills him because his hands refuse to work.
Context
23Onye na-echekwa ire ya na ọnụ ya
na-egbochiri onwe ya ọdachi. 24Onye nganga na onye mpako, onye na-akwa emo bụ aha ya.
Ọ na-eji oke nganga eme ihe niile. 25Oke ọchịchọ nke onye umengwụ na-ewetara ya ọnwụ
nʼihi na ọ jụrụ ịrụ ọrụ. 26Kwa ụbọchị ka ọ na-achọ inwe karịa,
ma onye ezi omume na-enye na-akpaghị oke. 27Chineke kpọrọ aja ndị na-emebi iwu asị,
nke ka nke, ma ọ bụrụ na ha na-enye onyinye a site na nzube ọjọọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.