Native Bible

Proverbs 20:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Lee, ihe a jọrọ njọ, ọ baghị uru,” ka onye na-azụ ahịa na-asị, ma mgbe ọ pụrụ ọ na-anya isi nʼihi ihe ọ zụtara.

Proverbs 20:14 in English

Proverbs 20:14 · Berean Standard Bible

“Worthless, worthless!” says the buyer, but on the way out, he gloats.

Context

12Ntị nke na-anụ ihe na anya nke na-ahụ ụzọ, ọ bụ Onyenwe anyị mere ha abụọ. 13Ahụla ịrahụ ụra nʼanya, ka ị ghara ịghọ onye ụkpa. Bilie, mụrụ anya, rụsie ọrụ ike, ka i nweekwa ihe oriri. 14“Lee, ihe a jọrọ njọ, ọ baghị uru,” ka onye na-azụ ahịa na-asị, ma mgbe ọ pụrụ ọ na-anya isi nʼihi ihe ọ zụtara. 15Ọlaedo dị, na ọtụtụ rubi nʼebe ọ bara ụba, ma egbugbere ọnụ nke na-ekwupụta ihe ọmụma bụ ọla dị oke ọnụahịa. 16Chiri uwe onye ahụ naara onye mba ọzọ nʼaka mbe. Jichiekwa ihe mbe ahụ o nyere nʼihi onye mba ọzọ ọ nara na mbe.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.