Native Bible

Proverbs 20:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Buru ụzọ nata ndụmọdụ tupu i mee ihe ọbụla ị chọrọ ime; ebula agha ma i bubeghị ụzọ pịa ọpịpịa.

Proverbs 20:18 in English

Proverbs 20:18 · Berean Standard Bible

Set plans by consultation, and wage war under sound guidance.

Context

16Chiri uwe onye ahụ naara onye mba ọzọ nʼaka mbe. Jichiekwa ihe mbe ahụ o nyere nʼihi onye mba ọzọ ọ nara na mbe. 17Nri e nwetara nʼụzọ aghụghọ na-atọ mmadụ ụtọ. Ma nʼikpeazụ aja ga-eju ya ọnụ. 18Buru ụzọ nata ndụmọdụ tupu i mee ihe ọbụla ị chọrọ ime; ebula agha ma i bubeghị ụzọ pịa ọpịpịa. 19Agwala onye na-akpa asịrị ihe nzuzo gị, nʼihi na ọ ga-akụ ya nʼekwe nye ụwa niile. 20Oriọna onye ahụ na-akọcha nne ya na nna ya ka Chineke na-afụnyụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.