Proverbs 18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1Onye ihe mmadụ na-adịghị amasị na-agbaso naanị ọchịchọ nke ya onwe ya,
na-alụsokwa ezi nzube niile ọzọ ọgụ. 2Nghọta adịghị atọ onye nzuzu ụtọ.
Naanị ihe ọ maara bụ ikwu uche ya. 3Mgbe onye ajọ omume na-abata, ka nleda anya na-abata,
otu a kwa nkọcha na-eweta ihere. 4Okwu ọnụ niile bụ mmiri dị omimi,
ma amamihe dị ka mmiri iyi na-asọ asọ. 5Ọ dịghị mma ime ka ikpe gara onye mere ihe ọjọọ,
si otu a gbochie onye aka ya dị ọcha inweta ikpe ziri ezi. 6Egbugbere ọnụ ndị nzuzu na-ebutere ha esemokwu,
ọnụ ha na-ebutere ha ihe otiti. 7Ọnụ onye nzuzu na-etinye ya na nsogbu,
egbugbere ọnụ ya bụ ọnya nye mkpụrụobi ya. 8Okwu niile nke onye na-agba asịrị na-ekwu dịka iberibe nri nʼatọ ezi ụtọ,
ha na-agbadakwa nʼime ime ala afọ. 9Onye dị umengwụ nʼọrụ ya
bụ nwanne nke onye mbibi. 10Aha Onyenwe anyị bụ ụlọ elu e wusiri ike,
ndị ezi omume na-agbaba nʼime ya izere ndụ. 11Akụ ndị ọgaranya bụrụ ha obodo e wusiri ike,
ọ bụkwa mgbidi dị elu nke a na-apụghị ịmafe nʼechiche ha. 12Tupu mmadụ adaa obi ya na-ejupụta na nganga,
ma inwe obi umeala na-eweta nsọpụrụ. 13Inye ọsịsa okwu tupu mmadụ ege ntị
bụ enweghị uche na ihe ihere. 14Ọ bụ mmụọ mmadụ na-akwado ya nʼoge nrịa nrịa,
ma mmụọ e tipịara etipịa, onye pụrụ ibuli ya? 15Obi onye nwere nghọta na-enweta ihe ọmụma,
nʼihi na ntị onye maara ihe na-achọpụta ya. 16Onyinye mmadụ na-akwara ya ụzọ sara mbara,
ọ na-edubakwa ya nʼihu ndị dị elu. 17Nʼikpe onye buru ụzọ kwuo ihe na-ese na-adị ka onye ikpe gaara,
tutu ruo mgbe mmadụ bịara bido ịjụ ya ajụjụ. 18Ife nza na-akwụsị esemokwu na ndọrọndọrọ
dị nʼetiti mmadụ abụọ ndị olu ha na-ala elu. 19Ọ dị mfe ịlụgbụ obodo karịa ime ka obi nwanne e mehiere tụgharịa.
Iwe ya na-adị ike dịka ọnụ ụzọ e jiri igodo tụchie. 20Site na mkpụrụ nke okwu ọnụ mmadụ mịpụtara ka afọ ga-eji ju ya.
Sitekwa nʼihe owuwe ubi nke egbugbere ọnụ ha ka ha ga-eji rijuo afọ. 21Ike ọnwụ na ndụ dị ire nʼaka.
Ndị hụrụ ya nʼanya ga-eri mkpụrụ ya. 22Nwoke ahụ chọtara nwunye chọtara ezi ihe.
Ọ na-anatakwa ihuọma site nʼaka Onyenwe anyị. 23Onye ogbenye na-arịọ arịrịọ maka ebere;
ma ọgaranya na-asa okwu ike ike. 24Onye nwere ọtụtụ ndị enyi ndị na-ekwesighị ga-abịa nʼịla nʼiyi mgbe na-adịghị anya,
ma ọ dị enyi nke na-arapara nso karịa nwanne.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.