Native Bible

Proverbs 18:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onye dị umengwụ nʼọrụ ya bụ nwanne nke onye mbibi.

Proverbs 18:9 in English

Proverbs 18:9 · Berean Standard Bible

Whoever is slothful in his work is brother to him who destroys.

Context

7Ọnụ onye nzuzu na-etinye ya na nsogbu, egbugbere ọnụ ya bụ ọnya nye mkpụrụobi ya. 8Okwu niile nke onye na-agba asịrị na-ekwu dịka iberibe nri nʼatọ ezi ụtọ, ha na-agbadakwa nʼime ime ala afọ. 9Onye dị umengwụ nʼọrụ ya bụ nwanne nke onye mbibi. 10Aha Onyenwe anyị bụ ụlọ elu e wusiri ike, ndị ezi omume na-agbaba nʼime ya izere ndụ. 11Akụ ndị ọgaranya bụrụ ha obodo e wusiri ike, ọ bụkwa mgbidi dị elu nke a na-apụghị ịmafe nʼechiche ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.