Ilu 18:8
Proverbs 18:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Okwu niile nke onye na-agba asịrị na-ekwu dịka iberibe nri nʼatọ ezi ụtọ, ha na-agbadakwa nʼime ime ala afọ.
Proverbs 18:8 in English
Proverbs 18:8 · Berean Standard Bible
The words of a gossip are like choice morsels that go down into the inmost being.
Context
6Egbugbere ọnụ ndị nzuzu na-ebutere ha esemokwu,
ọnụ ha na-ebutere ha ihe otiti. 7Ọnụ onye nzuzu na-etinye ya na nsogbu,
egbugbere ọnụ ya bụ ọnya nye mkpụrụobi ya. 8Okwu niile nke onye na-agba asịrị na-ekwu dịka iberibe nri nʼatọ ezi ụtọ,
ha na-agbadakwa nʼime ime ala afọ. 9Onye dị umengwụ nʼọrụ ya
bụ nwanne nke onye mbibi. 10Aha Onyenwe anyị bụ ụlọ elu e wusiri ike,
ndị ezi omume na-agbaba nʼime ya izere ndụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.