Ilu 18:6
Proverbs 18:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Egbugbere ọnụ ndị nzuzu na-ebutere ha esemokwu, ọnụ ha na-ebutere ha ihe otiti.
Proverbs 18:6 in English
Proverbs 18:6 · Berean Standard Bible
A fool’s lips bring him strife, and his mouth invites a beating.
Context
4Okwu ọnụ niile bụ mmiri dị omimi,
ma amamihe dị ka mmiri iyi na-asọ asọ. 5Ọ dịghị mma ime ka ikpe gara onye mere ihe ọjọọ,
si otu a gbochie onye aka ya dị ọcha inweta ikpe ziri ezi. 6Egbugbere ọnụ ndị nzuzu na-ebutere ha esemokwu,
ọnụ ha na-ebutere ha ihe otiti. 7Ọnụ onye nzuzu na-etinye ya na nsogbu,
egbugbere ọnụ ya bụ ọnya nye mkpụrụobi ya. 8Okwu niile nke onye na-agba asịrị na-ekwu dịka iberibe nri nʼatọ ezi ụtọ,
ha na-agbadakwa nʼime ime ala afọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.