Ilu 18:5
Proverbs 18:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ dịghị mma ime ka ikpe gara onye mere ihe ọjọọ, si otu a gbochie onye aka ya dị ọcha inweta ikpe ziri ezi.
Proverbs 18:5 in English
Proverbs 18:5 · Berean Standard Bible
Showing partiality * to the wicked is not good, nor is depriving the innocent of justice.
Context
3Mgbe onye ajọ omume na-abata, ka nleda anya na-abata,
otu a kwa nkọcha na-eweta ihere. 4Okwu ọnụ niile bụ mmiri dị omimi,
ma amamihe dị ka mmiri iyi na-asọ asọ. 5Ọ dịghị mma ime ka ikpe gara onye mere ihe ọjọọ,
si otu a gbochie onye aka ya dị ọcha inweta ikpe ziri ezi. 6Egbugbere ọnụ ndị nzuzu na-ebutere ha esemokwu,
ọnụ ha na-ebutere ha ihe otiti. 7Ọnụ onye nzuzu na-etinye ya na nsogbu,
egbugbere ọnụ ya bụ ọnya nye mkpụrụobi ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.