Native Bible

Proverbs 18:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọnụ onye nzuzu na-etinye ya na nsogbu, egbugbere ọnụ ya bụ ọnya nye mkpụrụobi ya.

Proverbs 18:7 in English

Proverbs 18:7 · Berean Standard Bible

A fool’s mouth is his ruin, and his lips are a snare to his soul.

Context

5Ọ dịghị mma ime ka ikpe gara onye mere ihe ọjọọ, si otu a gbochie onye aka ya dị ọcha inweta ikpe ziri ezi. 6Egbugbere ọnụ ndị nzuzu na-ebutere ha esemokwu, ọnụ ha na-ebutere ha ihe otiti. 7Ọnụ onye nzuzu na-etinye ya na nsogbu, egbugbere ọnụ ya bụ ọnya nye mkpụrụobi ya. 8Okwu niile nke onye na-agba asịrị na-ekwu dịka iberibe nri nʼatọ ezi ụtọ, ha na-agbadakwa nʼime ime ala afọ. 9Onye dị umengwụ nʼọrụ ya bụ nwanne nke onye mbibi.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.